11/05/2026
Let's translate this 👇 in Igbo Language:
Practical Christianity is not just about going to church every Sunday; it is about showing love, kindness, honesty, forgiveness, and compassion in our daily lives.
True Christians reflect Christ through their actions, words, and character. Help the needy, speak the truth, avoid hatred, and treat people with respect.
Let your lifestyle preach louder than your mouth. The world needs more believers who practice what they preach.
Christianity becomes powerful when people see God’s love through us. Be a light in your home, workplace, school, and community. Live the Gospel daily, not only on Sundays.
===
Igbo Language Translation (Ntughari n'asụsụ Igbo:
Iso Ụzọ Kraịst n’ezi omume abụghị naanị ịga ụka kwa Sọnde; ọ bụ igosi ịhụnanya, obiọma, eziokwu, mgbaghara na ebere n’ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Ezigbo Onye Kraịst na-egosipụta Kraịst site n’omume ya, okwu ya na agwa ọma ya. Nyere ndị nọ ná mkpa aka, kwuo eziokwu, zere ịkpọasị ma sọpụrụ mmadụ niile.
Ka ndụ gị kwusaa ozi ọma karịa ọnụ gị. Ụwa chọrọ ndị kwere ekwe na-eme ihe ha na-ekwusa.
Iso Ụzọ Kraịst na-enwe ike mgbe ndị mmadụ hụrụ ịhụnanya Chineke n’ime anyị. Bụrụ ìhè n’ụlọ gị, ọrụ gị, ụlọ akwụkwọ na obodo gị. Na-ebi Oziọma kwa ụbọchị, ọ bụghị naanị na Sọnde.
Sonyere anyị na Learn Igbo ka ị mụta asụsụ Igbo nke ọma.